Igbo
MKPEBI NKE NARỊ ABỤỌ NA IRI ASAA NA ISE NKE KỌMITII AFRỊKA MAKA IKIKE MMADỤ NA NKE NDỊ MMADỤ
A nakweere Mkpebi Nke Narị Abụọ na Iri Asaa na Ise nke Kọmitii Afrịka Maka Ikike Mmadụ na Nke Ndị Mmadụ (nke ndị Bekee debiri ka “ACHPR”), ya bụ “Nchedo Megide Ime Ihe Ike na Imebi Ikike Mmadụ n’ihi ezi nghọta maọbu nghọta nke e kwuru gbasara Mmeko ha Dị Ka Nwoke maọbụ Nwaanyị maọbụ Gbasara Njirimara ha Dị Ka Nwoke maọbụ Nwaanyị (nke ndị Bekee kpọrọ “real or imputed Sexual Orientation and Gender Identity” [SOGI]) n’afọ 2014. Mkpebi a na-akatọ ime ihe ike n’ihi ezi nghọta maọbu nghọta nke e kwuru gbasara mmeko ndị mmadụ dị ka nwoke maọbụ nwaanyị maọbụ gbasara njirimara mmadụ dị ka nwoke maọbụ nwaanyị, ma na-adụ obodo di n’Afrịka (ya bu, ndị bụ otu na Chata nke Afrịka maka Ikike Mmadụ na Nke Ndị Mmadụ) ndụmọdụ ka ha gbochie, mee nyocha na mezie ihe ike ndị Ọchịchị Steeti na ndị na-abughị ndị Ọchịchị Steeti na-eme site n’ezi nghọta maọbu nghọta nke e kwuru gbasara mmeko ndị mmadụ dị ka nwoke maọbụ nwaanyị, maọbụ gbasara njirimara mmadụ dị ka nwoke maọbụ nwaanyị.
ACHPR bụ nzukọ nọọro onwe ya nke Chata nke Afrịka guzobere maka ikwalite ma chebe ikike mmadụ nile n’Afrịka. Mkpebi Nke Narị Abụọ na Iri Asaa na Ise bụ ederede iwu nke izizi nke Kọmitii ACHPR nakweere banyere mmebi na mmegbu site n’ezi nghọta maọbu nghọta nke e kwuru gbasara SOGI.
275: Mkpebi maka Nchedo Megide Ime Ihe Ike na Imebi Ikike Mmadụ n’ihi ezi nghọta maọbu nghọta nke e kwuru gbasara Mmeko ha Dị Ka Nwoke Maọbụ Nwaanyị, maọbụ Njirimara Ha Dị Ka Nwoke maọbụ Nwaanyị
Kọmitii Afrịka Maka Ikike Mmadụ na Nke Ndị Mmadụ (Kọmitii Afrịka), na Nnọkọ Iri Ise na Ise nke Nkịtị ya e mere na Luanda, Angola, site n’ụbọchị iri abụọ na asatọ n’Ọnwa Eprel ruo ụbọchị iri na abụọ n’Ọnwa Mee n’afọ 2014:
Icheta na Iwu nke Abụọ nke Chata nke Afrịka maka Ikike Mmadụ na Nke Ndị Mmadụ (Chata nke Afrịka) gbochiri ịkpa mmadụ ọbụla oke maka ndimiiche ọbula dika mba, agbụrụ, agba ahụ, na ọ bụ nwoke maọbụ nwaanyị, asụsụ, okpukpe, echiche maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị maọbụ ihe ọzọ, obodo na òtù mmadụ si malite, maọbụ ọkwa si na ụba, ọmụmụ maọbụ ihe ọzọ;
Icheta ọzọkwa na Iwu nke Atọ nke Chata nke Afrịka nyere mmadụ niile nchedo nhata n’ebe iwu nọ;
Imarakwa na Iwu nke Anọ na nke Ise nke Chata nke Afrịka nyere mmadụ niile nsọpụrụ maka ndụ na izu okè nke onwe ha, ma gbochie mmekpa ahụ na mmeso na ntaramahụhụ ndị ọzọ dị ọjọọ na nke nleda anya;
Itu egwu na ime mmadụ ihe ike, ịkpa oke na mpụ ndị ọzọ na-emebi ikike mmadụ n’ihi ezi nghọta maọbu nghọta nke e kwuru gbasara mmeko ha dị ka nwoke maọbụ nwaanyị maọbụ gbasara njirimara ha dị ka nwoke maọbụ nwaanyị ka na-aga n’ihu n’akụkụ ụfọdụ n’Afrịka;
Imarakwa na ime ihe ike dị otu a gụnyere iji idịna n’ike wee “gbazie” mmadụ, mwakpọ, mmekpa ahụ, igbu mmadụ, njide aka ike, mkpọchi, igbu na ogbugbu na-enweghi ikike, mmadụ ifu efu mmanye, mpụnara mmadụ ihe na mmebiaha;
Itukwa egwu maka omume nke ime ihe ike na mmebi ikike ndị mmadụ na mmebi iwu ndị Ọchịchị Steeti na ndị na-abụghị ndị Ọchịchị Steeti na-ezubere ndị na-agbachitere mmadụ na ndị nzukọ otu obodo na-árú ọrụ n’Afrịka gbasara ihe metutara mmeko ndị mmadụ dị ka nwoke maọbụ nwaanyị maọbụ njirimara mmadụ dị ka nwoke maọbụ nwaanyị;
Inwe mwute nke ukwuu maka ọdịda nke ndị ọrụ mmanye iwu ime ezi nyocha ma kpee ndị na-eme ihe ike na ndị na-emebi ikike mmadụ n’ihi ezi nghọta maọbu nghọta nke e kwuru gbasara mmeko ha dị ka nwoke maọbụ nwaanyị maọbụ gbasara njirimara ha dị ka nwoke maọbụ nwaanyị ikpe;
- Na-akatọ mmụba nke ime ihe ike na mmebi ikike ndị mmadụ ndị ọzọ, tinyere igbu mmadụ, idịna n’ike, mwakpọ, mkpọchi aka ike na ụdị mkpagbu ndị ọzọ a na-eme ndị mmadụ n’ihi ezi nghọta maọbu nghọta nke e kwuru gbasara mmeko ha dị ka nwoke maọbụ nwaanyị maọbụ gbasara njirimara ha dị ka nwoke maọbụ nwaanyị;
- Na-akatọ kpọmkwem ọnọdụ nke mwakpo kpụ ọkụ n’ọnụ ndị Ọchịchị Steeti ndị na-abụghị ndị Ọchịchị Steeti na-eme ndị mmadụ n’ihi ezi nghọta maọbu nghọta nke e kwuru gbasara mmeko ha dị ka nwoke maọbụ nwaanyị maọbụ gbasara njirimara ha dị ka nwoke maọbụ nwaanyị;
- Na-akpọkụ Gọọmenti dị iche iche nọ na nkwekorịta ka ha gbaa mbọ hụ na ndị na-agbachitere ihe ndị ruuru mmadụ na-arụ ọrụ na ọnọdụ na-esi obi ha ike, ya bụ, ọnọdụ nke na-enweghi ihere, mmegwara maọbụ ikpe mpụ n’ihi ọrụ ha n’ichebe ikike mmadụ, nke gụnyere ikike otu ndị njirimara ha maka ihe ha ji bụrụ nwoke maọbụ nwaanyị pere mpe; ma
- Na-agbasị Gọọmenti dị iche iche ume ka ha kwụsị ihe ike na mmegbu niile, ma nke ndị Ọchịchị Steeti na-eme ma nke ndị na-abụghị ndị Ọchịchị Steeti na-eme, site na imeputa ma manye iwu kwesịrị ekwesị na-egbochi ma na-ata ahụhụ ụdị ime ihe ike niile, gụnyere ndị ahụ ezubere ndị mmadụ n’ihi ezi nghọta maọbu nghọta nke e kwuru gbasara mmeko ha dị ka nwoke maọbụ nwaanyị maọbụ gbasara njirimara ha dị ka nwoke maọbụ nwaanyị, ịgba mbọ hụ na e mere nyọcha zuru oke ma kpee ndị omekome ahụ ikpe nkwụmọtọ, na iguzobe usoro ikpe ízā maka mkpa nke ndị ahụhụ a metụtara.
Nke a nakweere na Nnọkọ Iri Ise na Ise nke Nkịtị nke Kọmitii Afrịka na Luanda, Angola, site n’ụbọchị iri abụọ na asatọ n’Ọnwa Eprel ruo ụbọchị iri na abụọ n’Ọnwa Mee n’afọ 2014.